Tuesday, May 10, 2022

ZUKWANIKE

 Zukwanike

Mazi imiano bu nwantakiri nne ya zuru nke oma. Ulo ha di nso n'ebe A na-ele akara. Nke a mere, oge obula, O na-eji akara E je n'ulo akwukwo!Ka oge luru, O gara akwukwo na Mahadum mana O kweghi iru nwayi.

Nke a mere ndi agbataobi ya jiri biara ya njem!Ka ha no n'ije ahu, ha juru ya si, ‘’Kedu ihe mere na I choghi iru nwayi n'ihi na anyi mala na umu ada mara mma nke ukwu na Obodo anyi a di otuto tinyerekwa na I bu onye nke ndi mmadu huru n'anya nke ukwu nke gosiri na I nwere ihe nile nwoke tozuru E tozu kwesiri I nwe?‘’

Nya bu ajuju gbagwojuru imiano anya O nwere si ha, ‘’Zukwanu nu ike.‘’ N'ihi nke a, ha malitere nawa na be ha n'otu, n'otu!Ka Igwe nuru ihe merenu, O nwere nwute nke ukwu, nke mere O jiri zigara imiano ozi si ya bia hu ya n'obi ya n'ihi na ya bu Igwe mara nna ya nke oma oge O di ndu. Ha bu ndi oke Amamihe. Nke a mere E jiri akpo nwa ntoorobia ahu, ‘’Mazi,‘’ nya na, ‘’Okammuta,‘’ na-agbanyeghi na O rubeghi nwayi maobu guruo akwukwo n'isi mmiri.

Ka ha no na-akpa nkata, Igwe juru ya si, ‘’O bu gini mere I ji A choghi iru nwayi, ka O bu na-ihughi Adamma bu nwa m nwayi?‘’

Mazi imiano malitere chiba ochi gwa Igwe si, ‘’O ka E rubeghi n'ihi na A ka m no na nnukwu nsogbu!‘’

Igwe juru ya si, ‘’Kedu ihe nsogbu anwu bu ka A mara ka A ga-esi gbowe ya?‘’

Imiano gwara ya si, ‘’Zukwanike.‘’ N'ihi nke a, Igwe kulitere hapu ya bawa n'ebe obibi ya nke mere ka imiano kulite si n'obi Eze puwa. Ka O no n'uzo A ga, O chetere ihe nne ya gwara ya, O malite guwa egwu!

O guru Egwu si,

Nne mu ukwu, gwara m A gwa!

Nna mu ukwu, gwara m A gwa!

Si mu nuta nwayi di mma, gwara m A gwa!

Na O bugh naani nwayi mara mma, gwara mu A gwa.

Ka O no na-agu nya bu egwu, Otu nwantakiri nwayi mara mma tiri mkpu n'oke oru si,

‘’Heez!Imiano, gbaakpum osiso tupu m piawa gi azu!‘’

Imiano gwara ya si,

‘’Zukwanike.‘’ N'ihi nke a, nwantakiri nwayi abu mara mma buniru ya elu tuo ya n'ala, gbawam!

O malitere bewe akwaa. Nke a mere ka nya bu nwayi mere ya ebere.

O kulitere imiano buru ya nawa na be ha. Nke a ka O mere site n'ibu ya n'isi. Ka ha nuru na be ha, mama imiano siri ya, ‘’Daalu.‘’

Mana tupu O fuo, imiano mere ka nne ya mara na O bu nya bu nwa ada turu ya n'ala. Nke a mere ka mama imiano jide nwa ada ahu si ya na O ga-ama imiano mmiri oku tupu O fuo!

Ka mkpuru ubochi asaa gasiri, nwa ada ahu malitere huba imiano n'anya n'ihi na imiano bu onye obi umeala. Imiano malitekwara huba nwata nwayi a n'anya n'ihi na O nwere omaiko n'ebe O no. Ka ihe ndi a na-eme, nne ya no na-ahuru ihe na E me nu!

Ka oge luru mgbe Chioma choro ina otu ubochi, nne imiano kporo ya n'akuku si ya, ‘’I huru nwa m n'anya?‘’

Chioma zara ya si, ‘’Mama Zukwanike, A huru m Zukwanike n'anya n'ihi na O bu ezigbo mmadu nke mbu E nwere n'Obodo a!‘’

Nke a mere ka nne imiano si ya nawa, na ha ga A bia hu ndi be ya!Ka nne imiano gwara ndi agbataobi ha ihe na-eme, ha nwere mmasi I so ya jee kutarata Chioma dika nwunye imiano. Nke a ka ha mere ngwa ngwa n'ihi na ndi be anyi siri na E mee ngwa, ngwa E mee gharia odachi.

Ka ha luru ebe ahu, ndi be Chioma nabatara ha nke oma n'ihi na Chioma A gwara ha ihe nile. Ha malitere kwube okwu iru nwayi nke Chioma kweteru na O ga-aru imiano nke mere ha jiri si ka ha nawa jezia kwado nke oma n'ihi na ije ga-adi abuo!

Ka ihe nile ndi a mechera, imiano kporo Chioma nawa be ya dika nwunye ya mana ndi mmadu malitere kpowa ha Mazi na Odozi aku, Imiano Chioma Zukwanike. Nke a mere ka Igwe chia ochi nke ukwu n'ihi na O nwebeghi onye obula zara aha ahu n'Obodo nile!

Nke a na-abiara gi site n'odu LogisticsOsiso.Com

0 comments:

Post a Comment